top of page
Search

UKE NA OLU OGBANJE OFIA



Effective Ogbanje and Uke Work, Incantations and affirmations. This is for Priest and Priestesses. Take some herbs do anti clockwise and say Chinwe Odiaka Onye Nimo ka anyi na ekwu okwuya na ubochi nke tata,


Anam ekopuya ndi ogbanje na nkwo, Ekopuya ndi ogbanje na eke, Ekopuya ndi ogbanje na orie, Ekopuya ndi ogbanje na afo, Na afia na ano na ubochi na ano onye anakpo chinwe odiaka, And do clockwise and repeat


Anyi na emechiteluya ifea makana onoro nso, ebe obuna chinwe no ka ndi ogbanje nine na enye ya nsogbu hapuya aka, ife obuna ana akpo ndi ofia na enye Chinwe nsogbu, ndi amuosu, ogboma, ndi eji gwo ogwu ego, ndi okeke ndi okoye ndi okafo ndi okonkwo, otu ndi nwulu anwu, otu ndi ocult


Otu ndi ogbu ola obala, otu ndi si na ime ofia nine, tata ka anyi na achupurufa aja na eke, chupurufa aja na orie, chupurufa aja na afo chupurufa aja na nkwa, chupurufa aja na afia na no na ubochi nano


Chinwe Ezeani no na obodo China, asim na iga adika echi na echi adighi agwu agwu, ndi obuna nina bu ndi ofia sina ife anaemelugi agaghi aga tata ka anyi na ekwughaliya welu kwuo na ife obuna bu ngozi ga elugi aka, ndi nwuluanwu na enye gi nsogbu, ndi akwuoha, ndi enili na ani,


Ndi iyi gburu, ndi akwaro akwa, ndi eji gwo ogwu ego, ma obu ife nna fa metalu, maobu ife nne fa metalu, anam asi ka isi baa ndia ofia na afia na no na ubochi na ano

ekwubiem okwu na isi gi tata welu sina obialu egbu gi gbuo onweya, ajommuoo obuna sina ife ina eme ama aga aga ka isi baa fa ofia,

ka ajo mmuo larula, ajo mmadu larula,


Ndi elom elom, ndi obialu uwa elighi ulu, ndi obialuwa anoghi ano, ndi ogbachu mmuo, ndi ogbachu mmadu, ndi omewa mmuoo ndi omewa mmadu tata ka mu na ekopu fa, welusi ka isi ba fa ofia, ike obuna na ewetaluya aka nkukocha, ife obuna na ewetaluya akpa eseasia, ife obuna na ebutelugi uke na mmuo ma obu na mmadu onughalu mmuo onu ghalu mmadu,


Ogbachu mmuo ogbachu mmadu, ndiofia chubagi fa afuna gi, fa fugodigi fa ama ama onye ibu, asim na obialu egbu gi ga eghu onweya Okilikili ka ana agba ukwu ose adighi aliya enu, nkili nkili ka ana ekili ododo ejiroya eni ozu, oweta mma ogaeji gbuoo gi ya gbuoya na aru ya,


Wepuruya uke mmuoo uke mmadu, nyanya mmuo nyanya mmadu ogbachu mmuoo ogbachu mmadu, onughara mmuoo onu ghara mmadu, ife sina ima anu di, ife sina ima akpata ego, ife sina ima eme uwa hi, ndi nwulu anwu, ndi na ebute uke, osina mmuoo,

osina mmadu,osina ndi nwulu anwu,


Osina ndi ehime ugwo, tata anyi na agbalu isi gi na aka ndia, anyi si ka isi bafa ofia, achoba gibu nti nti amafugi, obiara igbu gi gbuo onwe ya, agworo gi ogwu ka ogwu afu nagharia. Ndi nike bu ndi ilogi na ulo ahia na akwuchiri gi uzo, ka ike gwufa na muoo gwufa na mmadu,


Ife obuna na ckpuchi akala akagi na eme na ikpata ego owufusia, ife obuna na emegi akwa alili, anyi na agbalu isigi tata, ife obuna na egbochi akala aka gi anyi na agbalu isi gi na mbochi tata, ndanda ahu mmuoo, ndanda ahu mmadu tata kam si ka isi baa ga ofia, ife na afugi ufu, ife na ewetaligi obi nkolopu,


Okwu na uka mmuo okwu na uka mmadu agakata iru agaba azu, ndi ogbachu, ndi si na ife emelu agaghi adi mma anyi na agbalu isigi tata bu eke, gbalu isigi na orie, gbalu isigi na afo, gbalu isigi na nkwo, afia na ano ubochi na ano iseee. Obukwanu kam si goo ka osi lee. Okwu ekwusiri nnuoo iyi. Iseeeee!


Yagaziere unu

Priestess Grace Marachi Echets

CEO Idemmiri Spiritual Club



 
 
 

Comentarios

Obtuvo 0 de 5 estrellas.
Aún no hay calificaciones

Agrega una calificación

Follow

  • Whatsapp
  • Instagram
  • Facebook
  • Twitter
  • YouTube

Phone: +44 7444 040301 

Address

Ide Mmiri Headquarters

Waterview Drive,
Greenwich Peninsula, London SE10 0TW

London United Kingdom

© 2035 by Ide Mmiri Spiritual Club 

bottom of page